16Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmehie ya, nʼihi mmehie na nnupu isi ụmụ Izrel, ihe ọbụla mmehie ndị ahụ bụ. Ọ ga-achụkwa ụdị aja a nʼihi ụlọ nzute ahụ, nʼihi na ọ dị nʼetiti ebe obibi rụrụ arụ nke ụmụ Izrel.
17O nweghị onye ọbụla ọzọ ga-anọ nʼime ụlọ nzute ahụ, site nʼoge Erọn banyere nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ ịchụ aja mkpuchi mmehie tutu ruo mgbe ọ pụtara, mgbe ọ chụchara aja mkpuchi mmehie maka onwe ya na ezinaụlọ ya, na maka ụmụ Izrel niile.
18“Mgbe o si nʼebe ahụ pụta, gaa nʼebe ịchụ aja dị nʼihu Onyenwe anyị kpuchiere ya mmehie ya. Ọ ga-ewere ụfọdụ ọbara nwa oke ehi ahụ na nke mkpi ahụ tee ya na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja ahụ.
19Ọ ga-eji mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ ọbara ahụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ ugboro asaa iji hichapụ adịghị ọcha ya nʼihi ịrụ arụ ụmụ Izrel, na ido ya nsọ.
20“Mgbe Erọn chụchara aja mkpuchi mmehie maka Ebe ahụ Kachasị Nsọ, ụlọ nzute, nakwa ebe ịchụ aja, ọ ga-akpụbata mkpi ahụ e debere ndụ.