27Oke ehi nakwa mkpi maka ịchụ aja mmehie ahụ, bụ nke ewebatara ọbara ha nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, maka ikpuchi mmehie, ka aghaghị ibupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu; a ga-akpọ akpụkpọ ha, anụ ahụ ha na mgbịrị afọ ha niile ọkụ.
28Onye ga-akpọ ha ọkụ ga-asa uwe ya, saakwa ahụ ya tupu ọ laghachi nʼime obodo.
29“Nke a ga-abụrụ unu ụkpụrụ ebighị ebi. Nʼafọ ọbụla, unu ga-ebu ọnụ, hapụ ịrụ ọrụ ọbụla, nʼụbọchị iri nke ọnwa asaa. Iwu a dịrị nwa afọ ala maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu.
30Nʼihi na nʼụbọchị a ka a na-ekpuchiri unu mmehie unu, ime ka unu dịrị ọcha. Mgbe ahụ, unu ga-abụ ndị dị ọcha site na mmehie unu niile nʼihu Onyenwe anyị.
31Ọ bụ ụbọchị izuike nye unu, bụrụkwa ụbọchị unu ga-ebu ọnụ. Iwu a enweghị mgbanwe!