25Ọ ga-akpọkwa abụba anụ e ji chụọ aja mmehie ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.
26“Mgbe nwoke ahụ kpụgara mkpi ahụ nʼọzara hapụ ya, lọtara, ọ ga-asa ahụ ya na uwe ya tupu ọ laghachi nʼime obodo.
27Oke ehi nakwa mkpi maka ịchụ aja mmehie ahụ, bụ nke ewebatara ọbara ha nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, maka ikpuchi mmehie, ka aghaghị ibupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu; a ga-akpọ akpụkpọ ha, anụ ahụ ha na mgbịrị afọ ha niile ọkụ.
28Onye ga-akpọ ha ọkụ ga-asa uwe ya, saakwa ahụ ya tupu ọ laghachi nʼime obodo.
29“Nke a ga-abụrụ unu ụkpụrụ ebighị ebi. Nʼafọ ọbụla, unu ga-ebu ọnụ, hapụ ịrụ ọrụ ọbụla, nʼụbọchị iri nke ọnwa asaa. Iwu a dịrị nwa afọ ala maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu.