30Nʼihi na nʼụbọchị a ka a na-ekpuchiri unu mmehie unu, ime ka unu dịrị ọcha. Mgbe ahụ, unu ga-abụ ndị dị ọcha site na mmehie unu niile nʼihu Onyenwe anyị.
31Ọ bụ ụbọchị izuike nye unu, bụrụkwa ụbọchị unu ga-ebu ọnụ. Iwu a enweghị mgbanwe!
32Onye nchụaja e tere mmanụ, nke e doro nsọ dịka onye nchụaja ịnọchi nna ya, ga-achụ aja mkpuchi mmehie ndị a, yirikwa akwa ọcha ahụ, bụ uwe nsọ ahụ.
33Ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ na ụlọ nzute, ebe ịchụ aja na ndị nchụaja, na mkpokọta ndị obodo niile mmehie ha.
34“Nke a ga-abụ iwu ebighị ebi nye unu. Otu ugboro nʼotu afọ ka a ga-ekpuchi mmehie maka mmehie ndị Izrel niile.” E mezuru ihe ndị a niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.