6“Erọn ga-eweta oke ehi nke ya, maka aja mmehie iji kpuchie mmehie nke ya na nke ezinaụlọ ya.
7Emesịa, ọ ga-ewere mkpi abụọ ndị ahụ chee ha nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
8Ọ ga-efe nza nʼisi mkpi abụọ ahụ, ịchọpụta nke dịrị Onyenwe anyị nke ọzọ abụrụ nke ọ ga-ahapụ.
9Mkpi ahụ nza mara ga-abụ nke Onyenwe anyị, ya ka Erọn ga-egbu dịka aja mmehie.
10Ma mkpi ahụ nke nza mara dịka ewu na-ewere ọnọdụ iburu mmehie ka a ga-eche na ndụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi iji ya mee mmemme mkpuchi mmehie, a ga-ahapụ ya ka o buru mmehie niile kpafuo nʼọzara.