Levitikọs 17

“ ‘Onye Izrel ọbụla, na onye ọbịa ọbụla binyere unu nke gara ịchụ nta, gbuo anụ maọbụ nnụnụ ọbụla a na-eri eri, ga-awụfu ọbara ya were aja kpuchie ya.

Leviticus 17:13 (UKJV) And whatsoever man there be of the children of Israel, or of the strangers that sojourn among you, which hunts and catches any beast or fowl that may be eaten; he shall even pour out the blood thereof, and cover it with dust.

11Nʼihi na ndụ ihe nwere ndụ dị nʼọbara ya, ọ bụ nʼihi nke a ka m ji nye iwu na a ga-awụsa ọbara niile nʼelu ebe ịchụ aja, maka iji ya kpuchie mmehie unu. Ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie maka ndụ mmadụ.

12Nʼihi nke a, a sịrị ndị Izrel, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu, maọbụ onye ọbịa ọbụla nke bi nʼetiti unu ga-eri ọbara.”

13“ ‘Onye Izrel ọbụla, na onye ọbịa ọbụla binyere unu nke gara ịchụ nta, gbuo anụ maọbụ nnụnụ ọbụla a na-eri eri, ga-awụfu ọbara ya were aja kpuchie ya.

14Nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara. Ọ bụ ya mere m ji nye ụmụ Izrel iwu si unu erila ọbara anụmanụ ọbụla, nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara ya. Nʼihi ya onye ọbụla riri ọbara, a ga-ekewapụ ya site nʼetiti ndị m.

15“ ‘Mmadụ ọbụla, maọbụ nwa afọ ma ọ bụkwanụ onye ọbịa, nke riri anụ nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, ga-eji mmiri saa uwe ya na ahụ ya, ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi tupu ọ dị ọcha ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.