8“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nke a bụ ileda nna gị anya.
9“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne gị nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, maọbụ nwa nwanyị nke a mụụrụ nna gị, maọbụ nwa nwanyị nke nne gị mụrụ, ma a mụrụ ya nʼụlọ ma a mụrụ nʼama.
10“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nke nwa gị nwoke mụrụ, maọbụ nwa nwanyị nke nwa gị nwanyị mụrụ i nwe mmekọ edina; nʼihi na nke a ga-eweta nleda anya nye gị.
11“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nwunye nna gị mụrụ, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọ bụ nwa nna gị mụrụ; nwanne gị nwanyị ka ọ bụ.
12“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nwanyị nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nna gị, ha bụ otu ahụ.