Levitikọs 18

“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nwanyị nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nna gị, ha bụ otu ahụ.

Leviticus 18:12 (UKJV) You shall not uncover the nakedness of your father's sister: she is your father's near kinswoman.

10“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nke nwa gị nwoke mụrụ, maọbụ nwa nwanyị nke nwa gị nwanyị mụrụ i nwe mmekọ edina; nʼihi na nke a ga-eweta nleda anya nye gị.

11“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nwunye nna gị mụrụ, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọ bụ nwa nna gị mụrụ; nwanne gị nwanyị ka ọ bụ.

12“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nwanyị nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nna gị, ha bụ otu ahụ.

13“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nne gị nke nwanyị, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nne gị, ha bụ otu ahụ.

14“ ‘Ị gaghị eleda nwanne nna gị nke nwoke anya, site nʼijekwuru nwunye ya, ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nʼihi na nwunye nwanna gị ka ọ bụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.