20“ ‘A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a.
21“ ‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja. Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
22“ ‘Gị na nwoke edinala, dịka nwanyị na nwoke si edina. Ihe akpọrọ asị ka ọ bụ.
23“ ‘Gị na anụmanụ ọbụla edinakwala, site otu a merụọ onwe gị. Nwanyị agakwaghị ewere onwe ya nye ka ya na oke anụmanụ nwee mmekọrịta, arụ a na-adịghị eme eme ka ọ bụ.
24“ ‘Unu emerụkwala onwe unu site na-ime ihe ndị a, nʼihi na ihe ndị a bụ ihe mba ndị ahụ na-eme. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ga-eji chụpụ ha site nʼala ahụ m ga-enye unu.