26Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
27Ala m na-aga inye unu rụrụ arụ nʼihi na ndị bi nʼime ya na-eme omume ndị a rụrụ arụ.
28Unu emekwala ihe arụ ndị a, nʼihi na ọ bụrụ na unu emee ha, ọ ga-emeghe ọnụ ya gbọpụta unu, dịka o si mee mba niile bụ ndị buru unu ụzọ biri nʼime ya.
29“ ‘Onye ọbụla nʼetiti unu mere ihe arụ ndị a, ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.
30Nʼihi ya, lezienụ anya ka unu debe iwu m, ka unu ghara ime ihe arụ ndị a, nke ndị buru unu ụzọ biri nʼala ahụ mere. Ka unu gharakwa imerụ onwe unu site nʼomume arụ ndị a. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”