Levitikọs 19

“ ‘Unu ejila ike pụnara onye agbataobi unu ihe ya, maọbụ zuru ihe o nwere nʼohi. “ ‘Kwụọnụ onye ọbụla unu goro ọrụ ụgwọ ọrụ ya ọsịịsọ. Unu echela ka chi bọọ tupu unu akwụọ ya ụgwọ ya.

Leviticus 19:13 (UKJV) You shall not defraud your neighbour, neither rob him: the wages of him that is hired shall not abide with you all night until the morning.

11“ ‘Unu ezula ohi. “ ‘Unu aghala ụgha. “ ‘Unu aghọgbula ibe unu.

12“ ‘Unu aṅụla iyi ụgha, si otu a weta nkọcha nye aha Onyenwe anyị Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.

13“ ‘Unu ejila ike pụnara onye agbataobi unu ihe ya, maọbụ zuru ihe o nwere nʼohi. “ ‘Kwụọnụ onye ọbụla unu goro ọrụ ụgwọ ọrụ ya ọsịịsọ. Unu echela ka chi bọọ tupu unu akwụọ ya ụgwọ ya.

14“ ‘Akọchala onye ntị chiri, edochikwarala onye ìsì ihe nʼụzọ. Tụọ egwu Chineke. Abụ m Onyenwe anyị.

15“ ‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.