18“ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.
19“ ‘Unu ga-edebe iwu m niile. “ ‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “ ‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “ ‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.
20“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla akpọrọ nwaagbọghọ bụ ohu nwanyị nke a na-agbapụtabeghị, maọbụ nke na-enwerebeghị onwe ya, nke nwoke ọzọ chọrọ ịlụ, mee ka ha abụọ dinakọọ, a ga-ekpe ha abụọ ikpe nʼụlọikpe, ma a gaghị egbu ha, nʼihi na nwanyị ahụ abụghị onye nwe onwe ya.
21Ma nwoke ahụ ga-eweta aja ikpe ọmụma nye Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ọ ga-abụkwa ebule ka ọ ga-eji chụọ aja ahụ.
22Onye nchụaja ga-eji ebule aja ikpe ọmụma ahụ chụọrọ nwoke ahụ aja mkpuchi mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi mmehie o mere. A ga-agbaghakwara ya mmehie ya.