23“ ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ kụọ mkpụrụ osisi dị iche iche, unu erila mkpụrụ osisi ahụ mịrị nʼafọ nke mbụ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Ruo nʼafọ nke atọ, ha bụ ihe rụrụ arụ. Unu agaghị eri ha.
24Nʼafọ nke anọ, mkpụrụ nke osisi ndị ahụ niile ga-amị dị nsọ. Unu ga-eji ya nye Onyenwe anyị onyinye otuto.
25Site nʼafọ nke ise, mkpụrụ ọbụla ga-abụ nke unu. Nʼụzọ dị otu a ihe ha ga-amịpụta ga-adị ukwuu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
26“ ‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya. “ ‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase.
27“ ‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu.