26“ ‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya. “ ‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase.
27“ ‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu.
28“ ‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m Onyenwe anyị.
29“ ‘Emerụla nwa gị nwanyị site nʼịkwagide ya ka ọ bụrụ akwụna, ka ala unu ghara ijupụta nʼịgba akwụna na ihe ọjọọ dị iche iche.
30“ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị izuike m. Sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.