5“ ‘Mgbe unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja udo, soronụ ụkpụrụ m nyere unu chụọ ya, ka m nabata ya.
6Unu ga-eri ya nʼụbọchị ahụ unu chụrụ ya, maọbụ nʼụbọchị nke na-eso ụbọchị ahụ. Nke ọbụla fọdụrụ ruo ụbọchị nke atọ ka unu ga-esure ọkụ.
7Ọ bụrụ na unu erie ya nʼụbọchị nke atọ ihe arụ ka ọ bụ. A gaghị anabata aja ọbụla unu ga-eri nʼụbọchị nke atọ.
8Ikpe ga-ama onye ga-eri ya nʼụbọchị nke atọ nʼihi na o meela ka ihe nsọ Onyenwe anyị bụrụ ihe arụ. A ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
9“ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala.