Levitikọs 19

“ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala.

Leviticus 19:9 (UKJV) And when all of you reap the harvest of your land, you shall not wholly reap the corners of your field, neither shall you gather the gleanings of your harvest.

7Ọ bụrụ na unu erie ya nʼụbọchị nke atọ ihe arụ ka ọ bụ. A gaghị anabata aja ọbụla unu ga-eri nʼụbọchị nke atọ.

8Ikpe ga-ama onye ga-eri ya nʼụbọchị nke atọ nʼihi na o meela ka ihe nsọ Onyenwe anyị bụrụ ihe arụ. A ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.

9“ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala.

10A ghọrọchakwala mkpụrụ vaịnị niile mịrị nʼelu vaịnị gị, maọbụ chịkọrọ mkpụrụ ndị dara nʼala. Hapụrụ ha ụmụ ogbenye na ndị ọbịa, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.

11“ ‘Unu ezula ohi. “ ‘Unu aghala ụgha. “ ‘Unu aghọgbula ibe unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.