10“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwoke ọzọ, ya bụ nwunye onye agbataobi ya, nwoke ahụ na nwanyị kwara iko ka a ga-egbu.
11“ ‘Nwoke ọbụla ya na nwunye nna ya dinakọrọ nwe mmekọ, emerụọla nna ya. A ga-egbu nwoke ahụ na nwanyị ahụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
12“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwa ya, wetara onwe ha ikpe ọmụma, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ọ bụ arụ ka ha mere.
13“ ‘Ọ bụrụ nwoke na nwoke ibe ya edinakọọ nwee ụdị mmekọ edina nwoke na nwanyị, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ihe ha mere bụ ihe rụrụ arụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
14“ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu.