Levitikọs 20

“ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu.

Leviticus 20:14 (UKJV) And if a man take a wife and her mother, it is wickedness: they shall be burnt with fire, both he and they; that there be no wickedness among you.

12“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwa ya, wetara onwe ha ikpe ọmụma, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ọ bụ arụ ka ha mere.

13“ ‘Ọ bụrụ nwoke na nwoke ibe ya edinakọọ nwee ụdị mmekọ edina nwoke na nwanyị, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ihe ha mere bụ ihe rụrụ arụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.

14“ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu.

15“ ‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọrịta, a ga-egbu nwoke ahụ gbukwaa anụmanụ ahụ.

16“ ‘Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla abịaruo anụmanụ ọbụla nso dinakwuru ya inwe mmekọ, a ga-egbu nwanyị ahụ na anụmanụ ahụ, nʼihi na ha kwesiri ọnwụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.