Levitikọs 20

“ ‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọrịta, a ga-egbu nwoke ahụ gbukwaa anụmanụ ahụ.

Leviticus 20:15 (UKJV) And if a man lie with a beast, he shall surely be put to death: and all of you shall slay the beast.

13“ ‘Ọ bụrụ nwoke na nwoke ibe ya edinakọọ nwee ụdị mmekọ edina nwoke na nwanyị, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ihe ha mere bụ ihe rụrụ arụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.

14“ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu.

15“ ‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọrịta, a ga-egbu nwoke ahụ gbukwaa anụmanụ ahụ.

16“ ‘Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla abịaruo anụmanụ ọbụla nso dinakwuru ya inwe mmekọ, a ga-egbu nwanyị ahụ na anụmanụ ahụ, nʼihi na ha kwesiri ọnwụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.

17“ ‘Nwoke ọbụla ya na nwanne ya nwanyị nwere mmekọ edina, maọbụ nwa afọ nne ya maọbụ nwa nwunye nna ya, a ga-ekpochapụ ha site nʼihu ọha mmadụ nʼihi na ọ bụ ihe ihere dị ukwuu ka ha mere. Ọ merụọla nwanne ya, nʼihi ya ikpe ọmụma dị ya nʼisi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.