Levitikọs 20

“ ‘Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla abịaruo anụmanụ ọbụla nso dinakwuru ya inwe mmekọ, a ga-egbu nwanyị ahụ na anụmanụ ahụ, nʼihi na ha kwesiri ọnwụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.

Leviticus 20:16 (UKJV) And if a woman approach unto any beast, and lie down thereto, you shall kill the woman, and the beast: they shall surely be put to death; their blood shall be upon them.

14“ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu.

15“ ‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọrịta, a ga-egbu nwoke ahụ gbukwaa anụmanụ ahụ.

16“ ‘Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla abịaruo anụmanụ ọbụla nso dinakwuru ya inwe mmekọ, a ga-egbu nwanyị ahụ na anụmanụ ahụ, nʼihi na ha kwesiri ọnwụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.

17“ ‘Nwoke ọbụla ya na nwanne ya nwanyị nwere mmekọ edina, maọbụ nwa afọ nne ya maọbụ nwa nwunye nna ya, a ga-ekpochapụ ha site nʼihu ọha mmadụ nʼihi na ọ bụ ihe ihere dị ukwuu ka ha mere. Ọ merụọla nwanne ya, nʼihi ya ikpe ọmụma dị ya nʼisi.

18“ ‘Nwoke ọbụla nke ya na nwanyị nọ na nsọ nwanyị ya dinakọrọ nwee mmekọ ekpugheela adịghị ọcha nwanyị ahụ. Nwanyị ahụ nʼonwe ya ekpugheekwala adịghị ọcha nke ya. A ga-ebipụ ha abụọ site nʼetiti ndị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.