Levitikọs 20

“ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye nwanne ya, ọ bụ omume rụrụ arụ, nʼihi na ọ bụ ihe nleda anya nye nwanne ya. Ha ga-agba aka nwa.

Leviticus 20:21 (UKJV) And if a man shall take his brother's wife, it is an unclean thing: he has uncovered his brother's nakedness; they shall be childless.

19“ ‘Ị gaghị enwe mmekọ edina nʼetiti gị na nwanne nwanyị nne gị maọbụ nwanne nwanyị nna gị, nʼihi na nke a bụ ihe nleda anya nye onye ọbara jịkọrọ gị na ya. Ikpe ọmụma ga-adịrị unu abụọ.

20“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla na nwunye nwanne nna ya edinaa, ọ bụ omume ileda anya nye nwanne nna ya. Ha ga-ebu mmehie ha. Ha ga-anwụ na-amụtaghị nwa.

21“ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye nwanne ya, ọ bụ omume rụrụ arụ, nʼihi na ọ bụ ihe nleda anya nye nwanne ya. Ha ga-agba aka nwa.

22“ ‘Debenụ iwu ndị a na ụkpụrụ ndị a, ma gbasoonụ ha ka ala ahụ m na-eduba unu nʼime ya hapụ imeghe ọnụ ya gbụpụ unu.

23Unu agbasola omenaala ndị mba niile a m na-achụpụ site nʼala m na-enye unu, nʼihi na ha na-eme ihe ndị a niile m nyere unu nʼiwu emela. Ọ bụ nke a mere ihe banyere ha ji sọọ m oyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.