Levitikọs 20

“ ‘Debenụ iwu ndị a na ụkpụrụ ndị a, ma gbasoonụ ha ka ala ahụ m na-eduba unu nʼime ya hapụ imeghe ọnụ ya gbụpụ unu.

Leviticus 20:22 (UKJV) All of you shall therefore keep all my statutes, and all my judgments, and do them: that the land, where I bring you to dwell therein, spew you not out.

20“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla na nwunye nwanne nna ya edinaa, ọ bụ omume ileda anya nye nwanne nna ya. Ha ga-ebu mmehie ha. Ha ga-anwụ na-amụtaghị nwa.

21“ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye nwanne ya, ọ bụ omume rụrụ arụ, nʼihi na ọ bụ ihe nleda anya nye nwanne ya. Ha ga-agba aka nwa.

22“ ‘Debenụ iwu ndị a na ụkpụrụ ndị a, ma gbasoonụ ha ka ala ahụ m na-eduba unu nʼime ya hapụ imeghe ọnụ ya gbụpụ unu.

23Unu agbasola omenaala ndị mba niile a m na-achụpụ site nʼala m na-enye unu, nʼihi na ha na-eme ihe ndị a niile m nyere unu nʼiwu emela. Ọ bụ nke a mere ihe banyere ha ji sọọ m oyi.

24Ma agwala m unu sị, “Unu ga-eketa ala ha. Aga m enye ya unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kewapụtara unu doo unu iche site na mba ndị ọzọ niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.