Levitikọs 20

Mụ onwe m ga-emegide onye ahụ, bipụ ya site nʼetiti ndị ya, nʼihi na o merụọla ebe nsọ m, mee ka aha m gharakwa ịdị nsọ, site nʼiji ụmụ ya chụọrọ Molek aja.

Leviticus 20:3 (UKJV) And I will set my face against that man, and will cut him off from among his people; because he has given of his seed unto Molech, to defile my sanctuary, and to profane my holy name.

1Onyenwe anyị sịrị Mosis,

2“Gwa ụmụ Izrel, ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa ọbụla bi nʼetiti unu, nke weere nwa ya nye maka ịchụrụ Molek aja, aghaghị ime ka ọ nwụọ. Ndị mmadụ ga-ewere nkume tugbuo ya.

3Mụ onwe m ga-emegide onye ahụ, bipụ ya site nʼetiti ndị ya, nʼihi na o merụọla ebe nsọ m, mee ka aha m gharakwa ịdị nsọ, site nʼiji ụmụ ya chụọrọ Molek aja.

4Ọ bụrụ na ndị obodo elezie anya mee omume dịka a ga-asị na ha amaghị ihe onye ahụ mere, hapụkwa igbu ya, mgbe o were otu nʼime ụmụ ya nye Molek,

5mụ onwe m ga-emegide onye ahụ na ezinaụlọ ya bipụ ha site nʼetiti ndị ya. Otu a kwa ka m ga-eme ya na ndị niile so ya merụọ onwe ha site nʼife arụsị Molek.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.