Levitikọs 20

“Gwa ụmụ Izrel, ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa ọbụla bi nʼetiti unu, nke weere nwa ya nye maka ịchụrụ Molek aja, aghaghị ime ka ọ nwụọ. Ndị mmadụ ga-ewere nkume tugbuo ya.

Leviticus 20:2 (UKJV) Again, you shall say to the children of Israel, Whosoever he be of the children of Israel, or of the strangers that sojourn in Israel, that gives any of his seed unto Molech; he shall surely be put to death: the people of the land shall stone him with stones.

1Onyenwe anyị sịrị Mosis,

2“Gwa ụmụ Izrel, ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa ọbụla bi nʼetiti unu, nke weere nwa ya nye maka ịchụrụ Molek aja, aghaghị ime ka ọ nwụọ. Ndị mmadụ ga-ewere nkume tugbuo ya.

3Mụ onwe m ga-emegide onye ahụ, bipụ ya site nʼetiti ndị ya, nʼihi na o merụọla ebe nsọ m, mee ka aha m gharakwa ịdị nsọ, site nʼiji ụmụ ya chụọrọ Molek aja.

4Ọ bụrụ na ndị obodo elezie anya mee omume dịka a ga-asị na ha amaghị ihe onye ahụ mere, hapụkwa igbu ya, mgbe o were otu nʼime ụmụ ya nye Molek,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.