6“ ‘Aga m edo ihu m megide onye ọbụla gara jụọ ase site nʼaka mmụọ ọjọọ, maọbụ onye gara na dibịa afa gbaa afa, site nʼiso ha kwaa iko. Aga m ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
7“ ‘Doonụ onwe unu nsọ, ma dịkwanụ nsọ nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
8Debenụ ụkpụrụ m niile, ma gbasoonụ ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.
9“ ‘Onye ọbụla kọchara nne ya maọbụ nna ya ka a ga-egbu nʼihi na ọ kọchara nne na nna ya. Ọbara onye dị otu a ga-adịkwa ya nʼisi.
10“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwoke ọzọ, ya bụ nwunye onye agbataobi ya, nwoke ahụ na nwanyị kwara iko ka a ga-egbu.