7“ ‘Doonụ onwe unu nsọ, ma dịkwanụ nsọ nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
8Debenụ ụkpụrụ m niile, ma gbasoonụ ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.
9“ ‘Onye ọbụla kọchara nne ya maọbụ nna ya ka a ga-egbu nʼihi na ọ kọchara nne na nna ya. Ọbara onye dị otu a ga-adịkwa ya nʼisi.
10“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwoke ọzọ, ya bụ nwunye onye agbataobi ya, nwoke ahụ na nwanyị kwara iko ka a ga-egbu.
11“ ‘Nwoke ọbụla ya na nwunye nna ya dinakọrọ nwe mmekọ, emerụọla nna ya. A ga-egbu nwoke ahụ na nwanyị ahụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.