Levitikọs 21

Ọ gaghị esi nʼebe nsọ Chineke ya pụọ, maọbụ mee ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nʼihi na e doola ya nsọ site na ite ya mmanụ nsọ nke Chineke ya. Abụ m Onyenwe anyị.

Leviticus 21:12 (UKJV) Neither shall he go out of the sanctuary, nor profane the sanctuary of his God; for the crown of the anointing oil of his God is upon him: I am the LORD.

10“ ‘Onyeisi nchụaja, onye ahụ sitere nʼetiti ụmụnna ya, onye awụsara mmanụ nsọ nʼisi ya, onye ahọrọ doo nsọ iyiri uwe onye nchụaja ahụ, agaghị ahapụ agịrị isi ya ka ọ kpasasịa, maọbụ dọwaa uwe ya.

11Ọ gaghị abanye ebe ozu dị. Ọ gaghị emerụ onwe ya, ọ bụladị ma ozu ahụ ọ bụ nke nne ya maọbụ nke nna ya.

12Ọ gaghị esi nʼebe nsọ Chineke ya pụọ, maọbụ mee ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nʼihi na e doola ya nsọ site na ite ya mmanụ nsọ nke Chineke ya. Abụ m Onyenwe anyị.

13“ ‘Nwanyị onyeisi nchụaja ga-alụ ga-abụ nwanyị na-amaghị nwoke.

14Ọ gaghị alụ nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ nwanyị ya na di ya na-ebikwaghị, maọbụ nwanyị akwụna. Nwanyị ọ ga-alụ ga-abụ naanị nwanyị na-amaghị nwoke nke si nʼetiti ụmụnna ya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.