12Ọ gaghị esi nʼebe nsọ Chineke ya pụọ, maọbụ mee ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nʼihi na e doola ya nsọ site na ite ya mmanụ nsọ nke Chineke ya. Abụ m Onyenwe anyị.
13“ ‘Nwanyị onyeisi nchụaja ga-alụ ga-abụ nwanyị na-amaghị nwoke.
14Ọ gaghị alụ nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ nwanyị ya na di ya na-ebikwaghị, maọbụ nwanyị akwụna. Nwanyị ọ ga-alụ ga-abụ naanị nwanyị na-amaghị nwoke nke si nʼetiti ụmụnna ya,
15ka ọ ghara ime ka ụmụ ya ghara ịdị nsọ nʼetiti ụmụnna ya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ya nsọ.’ ”
16Onyenwe anyị gwara Mosis sị,