13“ ‘Nwanyị onyeisi nchụaja ga-alụ ga-abụ nwanyị na-amaghị nwoke.
14Ọ gaghị alụ nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ nwanyị ya na di ya na-ebikwaghị, maọbụ nwanyị akwụna. Nwanyị ọ ga-alụ ga-abụ naanị nwanyị na-amaghị nwoke nke si nʼetiti ụmụnna ya,
15ka ọ ghara ime ka ụmụ ya ghara ịdị nsọ nʼetiti ụmụnna ya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ya nsọ.’ ”
16Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
17“Gwa Erọn, ‘Nʼọgbọ niile nke na-abịa, o nweghị onye ọbụla nʼime ụmụ ụmụ gị nke akụkụ ahụ ya na-ezughị oke ga-abịa nso iwetara Chineke ya ihe oriri.