Levitikọs 21

Karịakwa ma onye ahụ bụ onye dị ya nnọọ nso, dịka nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị, maọbụ nwanne ya nwoke,

Leviticus 21:2 (UKJV) But for his kin, that is near unto him, that is, for his mother, and for his father, and for his son, and for his daughter, and for his brother.

1Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Gwa ndị nchụaja, ụmụ ndị ikom Erọn okwu sị ha, ‘Onye nchụaja ekwesighị imerụ onwe ya mgbe mmadụ nwụrụ nʼetiti ụmụnna ya.

2Karịakwa ma onye ahụ bụ onye dị ya nnọọ nso, dịka nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị, maọbụ nwanne ya nwoke,

3maọbụ nwanne ya nwanyị na-alụbeghị di, onye ọ na-elekọta nʼihi na o nweghị di. Nʼihi ya, o nwere ike merụọ onwe ya.

4Ma ọ gakwaghị eme onwe ya ka ọ ghara ịdị ọcha nʼetiti ndị ọgọ ya, ma site otu a merụọ onwe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.