Levitikọs 21

Ma ọ gakwaghị eme onwe ya ka ọ ghara ịdị ọcha nʼetiti ndị ọgọ ya, ma site otu a merụọ onwe ya.

Leviticus 21:4 (UKJV) But he shall not defile himself, being a chief man among his people, to profane himself.

2Karịakwa ma onye ahụ bụ onye dị ya nnọọ nso, dịka nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị, maọbụ nwanne ya nwoke,

3maọbụ nwanne ya nwanyị na-alụbeghị di, onye ọ na-elekọta nʼihi na o nweghị di. Nʼihi ya, o nwere ike merụọ onwe ya.

4Ma ọ gakwaghị eme onwe ya ka ọ ghara ịdị ọcha nʼetiti ndị ọgọ ya, ma site otu a merụọ onwe ya.

5“ ‘Ndị nchụaja ekwesighị ịkpụcha isi ha, maọbụ kpụchapụ akụkụ afụọnụ ha, maọbụ kaa ihe ọbụla nʼakpụkpọ ahụ ha.

6Ha ga-abụ ndị dị nsọ nye Chineke ha, ndị na-agaghị emekwa ka aha Chineke ha ghara ịdị nsọ. Nʼihi na ọ bụ ha na-eche nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja nsure ọkụ, bụ nri Chineke ha. Nʼihi ya, ha aghaghị ịdị nsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.