Levitikọs 21

“ ‘Ndị nchụaja ekwesighị ịkpụcha isi ha, maọbụ kpụchapụ akụkụ afụọnụ ha, maọbụ kaa ihe ọbụla nʼakpụkpọ ahụ ha.

Leviticus 21:5 (UKJV) They shall not make baldness upon their head, neither shall they shave off the corner of their beard, nor make any cuttings in their flesh.

3maọbụ nwanne ya nwanyị na-alụbeghị di, onye ọ na-elekọta nʼihi na o nweghị di. Nʼihi ya, o nwere ike merụọ onwe ya.

4Ma ọ gakwaghị eme onwe ya ka ọ ghara ịdị ọcha nʼetiti ndị ọgọ ya, ma site otu a merụọ onwe ya.

5“ ‘Ndị nchụaja ekwesighị ịkpụcha isi ha, maọbụ kpụchapụ akụkụ afụọnụ ha, maọbụ kaa ihe ọbụla nʼakpụkpọ ahụ ha.

6Ha ga-abụ ndị dị nsọ nye Chineke ha, ndị na-agaghị emekwa ka aha Chineke ha ghara ịdị nsọ. Nʼihi na ọ bụ ha na-eche nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja nsure ọkụ, bụ nri Chineke ha. Nʼihi ya, ha aghaghị ịdị nsọ.

7“ ‘Onye nchụaja agaghị alụ nwanyị e merụrụ site nʼịgba akwụna, maọbụ nwanyị lụtụrụla di nke kewapụrụ onwe ya site nʼahụ di ya, nʼihi na ndị nchụaja bụ ndị dị nsọ nye Chineke ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.