Levitikọs 21

“ ‘Onye nchụaja agaghị alụ nwanyị e merụrụ site nʼịgba akwụna, maọbụ nwanyị lụtụrụla di nke kewapụrụ onwe ya site nʼahụ di ya, nʼihi na ndị nchụaja bụ ndị dị nsọ nye Chineke ha.

Leviticus 21:7 (UKJV) They shall not take a wife that is a whore, or profane; neither shall they take a woman put away from her husband: for he is holy unto his God.

5“ ‘Ndị nchụaja ekwesighị ịkpụcha isi ha, maọbụ kpụchapụ akụkụ afụọnụ ha, maọbụ kaa ihe ọbụla nʼakpụkpọ ahụ ha.

6Ha ga-abụ ndị dị nsọ nye Chineke ha, ndị na-agaghị emekwa ka aha Chineke ha ghara ịdị nsọ. Nʼihi na ọ bụ ha na-eche nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja nsure ọkụ, bụ nri Chineke ha. Nʼihi ya, ha aghaghị ịdị nsọ.

7“ ‘Onye nchụaja agaghị alụ nwanyị e merụrụ site nʼịgba akwụna, maọbụ nwanyị lụtụrụla di nke kewapụrụ onwe ya site nʼahụ di ya, nʼihi na ndị nchụaja bụ ndị dị nsọ nye Chineke ha.

8Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na ọ bụ ha na-eche nri Chineke nʼihu ya. Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị dị nsọ, mụ onwe m na-eme ka unu dị nsọ.

9“ ‘Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja emerụọ onwe ya site nʼịghọ onye akwụna, o sitela na ndụ ọjọọ dị otu a wetara nna ya ihe ihere. A ga-akpọ ya ọkụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.