18O nweghị nwoke ọbụla nwere ọrụsị ọbụla ga-abịa nso, o nweghị nwoke kpuru ìsì, maọbụ onye ngwụrọ, maọbụ onye imi mpịa, maọbụ onye ụkwụ maọbụ aka ya na-ezughị oke,
19maọbụ onye ọkpụkpụ ụkwụ ya maọbụ ọkpụkpụ aka ya gbajiri,
20maọbụ onye mkpumkpu azụ dị, maọbụ nwa akakpọ, maọbụ onye na-adịghị ahụzi ụzọ, maọbụ onye agba na-ata, maọbụ onye akpụkpa dị nʼahụ, maọbụ onye mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa.
21O nweghị nwa nwa Erọn onye nchụaja ọbụla nwere ọrụsị ga-abịa iwetara Onyenwe anyị aja onyinye site nʼọkụ. Ebe ọ bụ na o nwere ọrụsị, ọ gaghị abịa nso iwetara Chineke ya nri.
22Ma o nwere ike iri nri ahụ dịkarịsịrị nsọ nke sitere na nri Chineke ya, tinyekwara nri ahụ dị nsọ.