20maọbụ onye mkpumkpu azụ dị, maọbụ nwa akakpọ, maọbụ onye na-adịghị ahụzi ụzọ, maọbụ onye agba na-ata, maọbụ onye akpụkpa dị nʼahụ, maọbụ onye mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa.
21O nweghị nwa nwa Erọn onye nchụaja ọbụla nwere ọrụsị ga-abịa iwetara Onyenwe anyị aja onyinye site nʼọkụ. Ebe ọ bụ na o nwere ọrụsị, ọ gaghị abịa nso iwetara Chineke ya nri.
22Ma o nwere ike iri nri ahụ dịkarịsịrị nsọ nke sitere na nri Chineke ya, tinyekwara nri ahụ dị nsọ.
23Kama ọ gaghị abịa nso akwa mgbochi ahụ maọbụ bịaruo ebe ịchụ aja nso, nʼihi ezughị oke ya. Ka ọ ghara imerụ ebe nsọ m, nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.’ ”
24Ya mere Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile iwu ndị a.