Levitikọs 22

Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

Leviticus 22:1 (UKJV) And the LORD spoke unto Moses, saying,

1Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

2“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha jiri nsọpụrụ nabata onyinye dị nsọ nke ụmụ Izrel na-edo nsọ nye m, ka ha ghara imerụ aha nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.

3“Gwa ha sị, ‘Nʼọgbọ unu niile na-abịa, ọ bụrụ na enwee onye ọbụla nʼagbụrụ unu nke bịara nso nʼihe ndị ahụ dị nsọ ụmụ Izrel na-edo nsọ nye Onyenwe anyị, mgbe onye ahụ nọ ọnọdụ dịka onye rụrụ arụ, a ga-esi nʼihu m wezuga onye ahụ. Abụ m Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.