28Egbula nne anụ na nwa ya nʼotu ụbọchị, maọbụ ehi maọbụ atụrụ.
29“Mgbe unu na-achụrụ Onyenwe anyị aja ekele, chụọnụ ya nʼụzọ ahụ a ga-anabata ya.
30Riekwanụ anụ aja ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, ka ọ hapụ ịfọdụ ruo echi ya. Abụ m Onyenwe anyị.
31“Unu ga-edebe iwu m ndị a niile, mee ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị.
32Unu emekwala ka aha m ghara ịdị nsọ. A ga-edo aha m nsọ nʼetiti ụmụ Izrel, nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.