8Unu ga-eweta aja e sitere nʼọkụ chụọ nye Onyenwe anyị. Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.’ ”
9Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya,
10“Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-aga inye unu, ghọta mkpụrụ ihe ubi nke mbụ unu, unu ga-ewetara onye nchụaja otu ukwu ọka site nʼọka unu ghọtara nʼubi unu.
11Ọ ga-anara unu ukwu ọka ahụ fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, ka a nabata ya. Ọ bụ nʼụbọchị ahụ ga-esote ụbọchị izuike ka onye nchụaja ga-efufe ya.
12Nʼotu ụbọchị ahụ e fufere ukwu ọka ahụ, unu ga-ewere nwa ebule na-enweghị ntụpọ, nke gbara naanị otu afọ, chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.