11Ọ ga-anara unu ukwu ọka ahụ fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, ka a nabata ya. Ọ bụ nʼụbọchị ahụ ga-esote ụbọchị izuike ka onye nchụaja ga-efufe ya.
12Nʼotu ụbọchị ahụ e fufere ukwu ọka ahụ, unu ga-ewere nwa ebule na-enweghị ntụpọ, nke gbara naanị otu afọ, chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.
13Aja mkpụrụ ọka ga-eso aja nsure ọkụ a. Ọ ga-eji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ a gwara mmanụ oliv, ka ọ bụrụ ihe e surere nʼọkụ na-esi ezi isi ọma nye Onyenwe anyị. A ga-enyekwa iko mmanya atọ dịka onyinye ihe ọṅụṅụ
14Unu agaghị eri achịcha, maọbụ ọka e ghere eghe, maọbụ ọka ọhụrụ tutu ruo mgbe unu buru ụzọ weta onyinye nye Chineke unu. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide ruo ọgbọ niile.
15“ ‘Site nʼụbọchị ahụ sotere ụbọchị izuike, bụ ụbọchị ahụ unu wetara ukwu ọka nke onyinye mfufe, gụpụta izu asaa zuru ezu.