Levitikọs 23

Gụpụtakwa iri ụbọchị ise site nʼụbọchị izuike ahụ mezuru izu asaa ahụ ma wetara Onyenwe anyị onyinye ọka ọhụrụ.

Leviticus 23:16 (UKJV) Even unto the next day after the seventh sabbath shall all of you number fifty days; and all of you shall offer a new food offering unto the LORD.

14Unu agaghị eri achịcha, maọbụ ọka e ghere eghe, maọbụ ọka ọhụrụ tutu ruo mgbe unu buru ụzọ weta onyinye nye Chineke unu. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide ruo ọgbọ niile.

15“ ‘Site nʼụbọchị ahụ sotere ụbọchị izuike, bụ ụbọchị ahụ unu wetara ukwu ọka nke onyinye mfufe, gụpụta izu asaa zuru ezu.

16Gụpụtakwa iri ụbọchị ise site nʼụbọchị izuike ahụ mezuru izu asaa ahụ ma wetara Onyenwe anyị onyinye ọka ọhụrụ.

17Site nʼebe ọbụla unu bi, unu ga-ewetara Onyenwe anyị ogbe achịcha abụọ nke unu ji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ, nke e ji ihe na-eko achịcha mee, ya bụ yiist, dịka aja mfufe nke mkpụrụ mbụ nye Onyenwe anyị.

18Tinyere achịcha a, unu ga-eweta ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, na otu nwa oke ehi, na ebule abụọ. Ha ga-abụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ya na aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ, aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.