19Unu ga-ejikwa otu mkpi chụọ aja mmehie. Werekwa ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja udo.
20Onye nchụaja ga-efufe ụmụ atụrụ abụọ ndị a, na achịcha ndị si na mkpụrụ mbụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha bụ aja dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọ bụkwa ndị nchụaja ga-ewere ha dịka nri ha.
21Nʼotu ụbọchị ahụ unu ga-akpọsakwa mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ ga-adịgide ebighị ebi site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile, nʼebe ọbụla unu bi.
22“ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ niile nke ubi unu. Hapụrụnụ ha ụmụ ogbenye, na ndị ọbịa. Hapụkwara ha mkpụrụ ubi niile dara nʼala. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
23Onyenwe anyị gwara Mosis sị,