Levitikọs 23

Nʼụbọchị nke mbụ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ nʼụbọchị ahụ.

Leviticus 23:35 (UKJV) On the first day shall be an holy convocation: all of you shall do no servile work therein.

33Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

34“Gwa ụmụ Izrel, ‘Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa nke asaa, ka unu ga-amalite mmemme Ụlọ Ikwu Onyenwe anyị. A ga-eme ya ụbọchị asaa.

35Nʼụbọchị nke mbụ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ nʼụbọchị ahụ.

36Nʼụbọchị ọbụla nʼime ụbọchị asaa ndị a niile ka a ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ. Nʼụbọchị nke asatọ ka mkpọkọta dị nsọ ga-adị. A ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼụbọchị a. Ọ bụ mkpokọta mmechi, nʼihi ya, a gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.

37(“ ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka, mgbe a ga-ekwusa mkpọkọta dị nsọ maka iwetara Onyenwe anyị onyinye nri, ya bụ, onyinye aja nsure ọkụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na aja dị iche iche, na onyinye ihe ọṅụṅụ dịka e sị hazie na ọ ga na-adị kwa ụbọchị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.