39“ ‘Ya mere, malite nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa asaa, mgbe unu webatasịrị ihe ubi unu, meerenụ Onyenwe anyị mmemme ụbọchị asaa, ụbọchị nke mbụ, na ụbọchị nke asatọ ga-abụ ụbọchị izuike.
40Nʼụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere ụfọdụ mkpụrụ osisi dị mma nke si nʼosisi unu na-amị mkpụrụ, gbutekwa igu nkwụ, na alaka osisi nwere ahịhịa ndụ, na osisi pọpla, jiri ha mee mmemme obi ụtọ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu ụbọchị asaa.
41Mmemme ụbọchị asaa a ga-adị nye Onyenwe anyị nʼafọ niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ unu niile. Ọ bụkwa nʼọnwa nke asaa ka unu ga-eme mmemme a.
42Nʼoge mmemme a, ụmụ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ e ji alaka osisi na ahịhịa wuo ụbọchị asaa. Ụmụ afọ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ dị otu a.
43Nke a ga-echetara ọgbọ ụmụ Izrel niile na mgbe m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, unu biri nʼụlọ e ji osisi na ahịhịa wuo nʼọzara. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”