Levitikọs 23

“ ‘Ya mere, malite nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa asaa, mgbe unu webatasịrị ihe ubi unu, meerenụ Onyenwe anyị mmemme ụbọchị asaa, ụbọchị nke mbụ, na ụbọchị nke asatọ ga-abụ ụbọchị izuike.

Leviticus 23:39 (UKJV) Also in the fifteenth day of the seventh month, when all of you have gathered in the fruit of the land, all of you shall keep a feast unto the LORD seven days: on the first day shall be a sabbath, and on the eighth day shall be a sabbath.

37(“ ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka, mgbe a ga-ekwusa mkpọkọta dị nsọ maka iwetara Onyenwe anyị onyinye nri, ya bụ, onyinye aja nsure ọkụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na aja dị iche iche, na onyinye ihe ọṅụṅụ dịka e sị hazie na ọ ga na-adị kwa ụbọchị.

38Unu ga-enye onyinye ndị a, tinyere onyinye a na-enye Onyenwe anyị nʼụbọchị izuike, na tinyere onyinye ndị ọzọ unu na-enye na ihe ndị ọzọ unu kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu niile unu na-enye Onyenwe anyị.)

39“ ‘Ya mere, malite nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa asaa, mgbe unu webatasịrị ihe ubi unu, meerenụ Onyenwe anyị mmemme ụbọchị asaa, ụbọchị nke mbụ, na ụbọchị nke asatọ ga-abụ ụbọchị izuike.

40Nʼụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere ụfọdụ mkpụrụ osisi dị mma nke si nʼosisi unu na-amị mkpụrụ, gbutekwa igu nkwụ, na alaka osisi nwere ahịhịa ndụ, na osisi pọpla, jiri ha mee mmemme obi ụtọ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu ụbọchị asaa.

41Mmemme ụbọchị asaa a ga-adị nye Onyenwe anyị nʼafọ niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ unu niile. Ọ bụkwa nʼọnwa nke asaa ka unu ga-eme mmemme a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.