14“ ‘Ọ bụrụ na i resiri onye agbataobi gị ala, maọbụ na o nwere nke ọ zụrụ site nʼaka gị, unu aghọgbula ibe unu.
15Ị ga-azụrụ ala site nʼaka onye agbataobi dịka ọnụọgụgụ afọ si dị site nʼafọ inwere onwe. Ha ga-eresi gị ya dịka ọnụọgụgụ afọ ole fọdụrụ maka ịkọ ihe nʼala ahụ.
16Ọ bụrụ na a zụrụ ala ahụ nso nso mmemme iri afọ ise a, ọnụahịa ala ahụ ga-adị ala, ọ bụrụkwanụ na ọ dị anya site na mmemme ahụ, ọnụahịa ya ga-adị elu, nʼihi na ụgwọ onye ahụ na-akwụ bụ ụgwọ ugboro ole ọ ga-akụ ihe nʼala ahụ.
17Unu emegbula ibe unu kama tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
18“ ‘Gbasoonụ ụkpụrụ m, ma lezie anya imezu ihe m nyere nʼiwu, ka unu nwee ike ibi obi udo nʼala ahụ.