17Unu emegbula ibe unu kama tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
18“ ‘Gbasoonụ ụkpụrụ m, ma lezie anya imezu ihe m nyere nʼiwu, ka unu nwee ike ibi obi udo nʼala ahụ.
19Mgbe ahụ, ala ga-amị mkpụrụ ya, unu ga-eriju afọ, birikwa nʼala ahụ nʼudo.
20Unu nwere ike jụọ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị ga-eri nʼafọ nke asaa ahụ ebe ọ bụ na anyị agaghị akụ ihe ọbụla, maọbụ wee ihe ubi ọbụla nʼafọ ahụ?”
21Aga m ezitere unu ngọzị dị ukwuu nʼafọ nke isii, nke ga-eme ka ala mee ihe omume nke ga-ezuru unu afọ atọ.