Levitikọs 25

Ihe onwunwe ndị Livayị bụ nke e nwere ike ịgbapụta, bụ ndị a, ụlọ niile e rere nke dị nʼobodo ha nwere. Ọ ga-abụ nʼafọ inwere onwe ka aga enwetaghachi ha, nʼihi na ụlọ ndị ahụ dị nʼobodo ndị Livayị bụ naanị oke ha nwere nʼetiti ụmụ Izrel.

Leviticus 25:33 (UKJV) And if a man purchase of the Levites, then the house that was sold, and the city of his possession, shall go out in the year of jubile: for the houses of the cities of the Levites are their possession among the children of Israel.

31Ma ụlọ ndị dị nʼobodo nta na-enweghị mgbidi a ga-agụ ha dịka ihe dị nʼọhịa. E nwere ike ịgbapụta ha, ha bụkwa nke a ga-eweghachite mgbe afọ inwere onwe ruru.

32“ ‘Ma banyere obodo niile nke ndị Livayị dị iche iche. Ha nwere ikike ịgbapụta ụlọ ha dị nʼime nketa ha mgbe ọbụla.

33Ihe onwunwe ndị Livayị bụ nke e nwere ike ịgbapụta, bụ ndị a, ụlọ niile e rere nke dị nʼobodo ha nwere. Ọ ga-abụ nʼafọ inwere onwe ka aga enwetaghachi ha, nʼihi na ụlọ ndị ahụ dị nʼobodo ndị Livayị bụ naanị oke ha nwere nʼetiti ụmụ Izrel.

34Ma a gaghị ere ala ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara obodo ha gburugburu ere, nʼihi ọ bụ ihe ha nwee nʼọha ruo ebighị ebi.

35“ ‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye ruo na o nweghị ike inyere onwe ya aka, ọ dị gị nʼaka inyere ya aka, kpọbata ya ka ọ bịa biri nʼụlọ gị dịka ị ga-esi kpọbata onye ọbịa. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-anọgide biri nʼetiti unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.