Levitikọs 25

Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu.

Leviticus 25:42 (UKJV) For they are my servants, which I brought forth out of the land of Egypt: they shall not be sold as bondmen.

40Kama ị ga-emeso ya mmeso dịka ị ga-esi meso onye ọrụ e goro ego, maọbụ dịka onye ọbịa nọ nʼetiti unu. Ọ ga-ejere gị ozi tutu ruo afọ inwere onwe.

41Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha.

42Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu.

43A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ. Tụọnụ egwu Chineke unu.

44“ ‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.