49Nwanne nne ya, maọbụ nwanne nna ya, maọbụ nwanna nʼikwu ha ọbụla nwere ike ịgbapụta ya. Ọ nwekwara ike ịgbapụta onwe ya ma ọ bụrụ na ọ kpata ego.
50Ya na onye ahụ o resiri onwe ya ga-agụ afọ ole ọ bụ site na mgbe o rere onwe ya ruo nʼafọ inwere onwe. Ego a ga-akwụ nʼihi ịgbapụta ya ga-abụ ego ọ ga-efu ịkwụ ohu ọzọ ụgwọ ịrụ ọrụ ọnụọgụgụ afọ ndị ahụ niile.
51Ọ bụrụ nʼọtụtụ afọ fọdụrụ, ọ ga-esite nʼọnụ ego e rere ha kwụọ nke dị ukwu dịka ego mgbapụta ha. Naanị ihe ntakịrị ga-apụ nʼime ego ahụ.
52Ọ bụrụ naanị afọ ole na ole fọdụrụ tupu afọ inwere onwe eruo, ọ ga-agụkọ ihe ego ahụ pụtara, kwụọ ya maka ịgbara onwe ya dịka o kwesiri.
53A ga-emeso ha dịka ndị ọrụ e goro ego kwa afọ, ma ị ga-ahụ na onye ha nọ nʼokpuru ya agaghị eji aka ike chịa ha.