51Ọ bụrụ nʼọtụtụ afọ fọdụrụ, ọ ga-esite nʼọnụ ego e rere ha kwụọ nke dị ukwu dịka ego mgbapụta ha. Naanị ihe ntakịrị ga-apụ nʼime ego ahụ.
52Ọ bụrụ naanị afọ ole na ole fọdụrụ tupu afọ inwere onwe eruo, ọ ga-agụkọ ihe ego ahụ pụtara, kwụọ ya maka ịgbara onwe ya dịka o kwesiri.
53A ga-emeso ha dịka ndị ọrụ e goro ego kwa afọ, ma ị ga-ahụ na onye ha nọ nʼokpuru ya agaghị eji aka ike chịa ha.
54“ ‘Ma ọ bụrụ na e nweghị ike gbapụta ya site nʼụzọ ndị a niile, ya na ụmụ ya ga-enwere onwe ha mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru.
55Nʼihi na mụ ka ụmụ Izrel bụ ndị ohu nye. Ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara site nʼala Ijipt. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.